Abu 237- Gab'olu! gab'olu! ayi bu ndi Chineke
Abu 237- Gab'olu! gab'olu! ayi bu ndi Chineke |
Verse 1
Gab'olu! gab'olu! ayi bu ndi Chineke;
K'ayi sor'uzọ nke Onye-nw'ayi zoro ukwu.
Ndum-odu-Ya gabu ihe nagb'ayi ume;
K'ayi jis'ike n'ilu nk'Ọ si ayi lua!
Kọrọs:-
Nal'olu! . . . nal'olu!
Nal'olu! . . . nal'olu!
Nel'anya! . . . neche nche!
Nal'olu rue mgbe Kraist gabia!
Verse 2
Gab'olu! gab'olu! k'anenye ndi'agu nri,
K'edur'ony'ike gwuru ga na miri ndu;
Inya-isi-ayi gabu n'obe nke Jisus,
M'ayi nekwusa, si na “nzọputa b'onyinye!”
Verse 3
Gab'olu! gab'olu! olu diri ora;
Al'eze nk'ochichiri na nmehie gada.
Agebulite Aha Jehova elu;
N'ok'olu k'agabu: “Nzọputa b'onyinye!”
Verse 4
Gab'olu! gab'olu! n'ike nke Onye-nw'ayi;
Okp'eze n'uwe ọcha gab'ugw'olu-ayi.
Mgb'ayi na ndi-nzuko Kraist nile gebikota,
Ayi gesso ha neti, “Nzọputa b'onyine!” Amen.
Abu 237- Gab'olu! gab'olu! ayi bu ndi Chineke
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com