Abu 236- Umu, je kwuputa Jisus
Abu 236- Umu, je kwuputa Jisus |
Verse 1
Umu, je kwuputa Jisus,
K'Ọ si nwu izọput'ayi;
K'Ọ sin ye ihe-ngbaputa
Iji topu ayi na njọ.
Kọrọs:-
E, ayi geje kwusa Jisus,
Onye di ọcha, di nwayọ, bu Jisus;
E, ayi geje kwusa Jisus,
Nke nwuru n'ihi ayi.
Verse 2
Kwusa ndu-Ya di um'ala,
Kowa olu ọma-Ya;
Kwusa ozizi-Ya di nsọ,
N'oku utọ nk'Ọ nakpo.
Verse 3
Ko akuko di ebube
K'Ọ si nwu na Kalvari;
Akpogburi n'ihi njọ-ayi
Eze nke ndu n'otuto.
Verse 4
Kosara umu-nne-unu,
N'ibe, n'enyi-unu dum;
Umu, gwarita onw'unu:
Jisus hur'ayi dum n'anya! Amen.
Abu 236- Umu, je kwuputa Jisus
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com