Abu 205- Chuku, nyocham, nwa omumem
Abu 205- Chuku, nyocham, nwa omumem |
Verse 1
Chuku, nyocham, nwa omumem,
Ka ndum puta ihe
K'o si di n'anya-nnyocha-Gi:
Me ka m'h'uzọm nile.
Verse 2
Nyocha uchem, mata obim,
Nani Gi mazuru;
Me k'ih'omimi nke di ya
Puta ihe n'irum.
Verse 3
K'ihe nwuba n'ebe-nzuzọ,
Ebe agu njọ di;
Met'ako-nuchem k'o we so
Nmehie nile oyi.
Verse 4
Nyo echichem, bu is'iyi
Nke omumem nile;
Im'ulo ebe ih'ure
Nabu eze n'obi.
Verse 5
K'anya-I, nke di k'oku-nnucha,
Nyocha ebe nile,
M'we da n'iru Gi n'ikp'azu
Site n'amara-Gi.
Verse 6
Otu a ka m'gamazu ihe
M'mara nwanti ugbu a-
Na nani Chuku nime Kraist
Bu ok'ihu-n'anya! Amen.
Abu 205- Chuku, nyocham, nwa omumem
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com