Abu 198- Achorom ka m'yie Jisus
Abu 198- Achorom ka m'yie Jisus |
Verse 1
Achorom ka m'yie Jisus,
N'obi ume-ala;
Ọ digh aj'okwu o bula
Si n'onu-Ya puta.
Verse 2
Achorom ka m'yie Jisus,
N'ekpere mgbe nile;
Nani Ya nano n'el'ugwu
Zute Nna n'eb'ahu.
Verse 3
Achorom ka m'yie Jisus,
Ọ digh oge m'huru
N'Ọ rapuru obi'ọma-Ya
Mgbe anesogbu Ya.
Verse 4
Achorom ka m'yie Jisus,
Neme nma mgbe nile;
Ka ewe kwue banyerem, si,
“Ọ mere ike-ya!”
Verse 5
Achorom ka m'yie Jisus,
Nke gwara ora, si,
“Kwenu k'umu-nta biakutem!”-
Agameje za Ya.
Verse 6
Ma eyighm Jisus ma-oli,
K'ony'o bula gahu!
Jisus, ziterem amara-I,
We mem ka m'di ka Gi! Amen.
Abu 198- Achorom ka m'yie Jisus
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com