Abu 191- Mgb'udo, dik'osimiri, neru n'uzọm
Verse 1
Mgb'udo, dik'osimiri, neru n'uzọm,
Mgbe nsọgbu biara k'ebili;
N'onodum o bula I mewom ka m'si,
“Ọ di nma, o diri obim nma.”
Kọrọs:-
Ọ di nma . . . o di nma;
Ọ di nma, o diri obim nma.
Verse 2
Ekwensu gesogbu, onwunwa gabi;
Ka m'tukwasi obim na nka:
Na Kraist amatawo na ike adighm,
We wusi obara-Ya n'ihim.
Verse 3
Nmehiem-echiche nka nanyem ok'onu?
Nmehiem-ha nile, ka ha ra,
Di n'obe Jisus, ebughkwam ha ozo:
To Chuku! to Chuku, nkpur'obim!
Verse 4
N'ebe m'no idi ndu bu Kraist mgbe nile!
Ọ buru na onwu abia,
Ọ gagh-ewutam; n'onwu dika na ndu,
I genye nkpur'obim Udo-Gi.
Verse 5
Jisus, o b'obibia-G k'ayi nechere;
Ili agagh-ab'ulo-ayi:
Opi nke mo-ozi! olu nke Chuku!
Olil'anya, n'iz'ike obim! Amen.
Abu 191- Mgb'udo, dik'osimiri, neru n'uzọm.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com