Abu 186- Chuku, ka m'so uzọ-I
Abu 186- Chuku, ka m'so uzọ-I |
Verse 1
Chuku, ka m'so uzọ-I,
K'ochichiri-ya ra;
Wer'aka-Gi duziem,
Roputaram uzọ.
Verse 2
Ọ di nma m'o di njọ,
Ọ gakachsi nma;
Ọ gbago, zir'ezi,
Ọ gedu n'iz'ike.
Verse 3
M'gagh-ator'onodum,
M'nwe ike m'gagh-ekwe;
Chineke, rotaram,
Ka m'nagazi nk'ọma.
Verse 4
Al'eze nke m'nachọ
Bu nke-Gi; ya mere
K'uzọ-ya buru nke-I,
Ka m'ghara ikpafu.
Verse 5
Wer'ikom mejue ya
N'onu m'obu n'uju;
Otu o di gi nma
Rotaram njọ na nma.
Verse 6
Rotaram ndi-enyim,
Oriam, n'aru-ikem;
Rotaram ich'uchem,
Akum m'ob'ogbenyem.
Verse 7
Nroputa abugh nkem,
N'ih'ukwu, n'ihe nta;
Bur'Onye-ndum, n'Ikem,
Uchem, n'Ihem nile. Amen.
Abu 186- Chuku, ka m'so uzọ-I
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com