Abu 172- Onye-nw'ayi, nechetam
Abu 172- Onye-nw'ayi, nechetam |
Verse 1
Onye-nw'ayi, nechetam,
Sachapu nmehie nkem;
zọputam n'agu-njọ uwa,
Me k'obim di ọcha.
Verse 2
Onye-nw'ayi, nechetam,
Nchekasi nakpagbum;
Ka m'buru ezi oru-Gi,
Mara iz'ike-Gi.
Verse 3
Onye-nw'ayi, nechetam,
Ekwela ka m'kpafue;
Nim'ochichiri n'ich'uche
Gosim uzọ igwé.
Verse 4
Onye-nw'ayi, nechetam,
Mgb'ahuhu riri nne,
Mgbe ony'iro nemegidem,
Onye-nzọtam, no nsọm.
Verse 5
Onye-nw'ayi, nechetam,
K'o gabu mgbe m'nwuru,
Ka m'hu ihe nk'ebigh-ebi,
Ket'oke n'onu-Gi.
Verse 6
Onye-nw'ayi, nechetam,
Ka m'we bua n'el'igwé,
Neto Gi na Nna na Mọ Nsọ
N'abu nke otuto. Amen.
Abu 172- Onye-nw'ayi, nechetam
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com