Abu 169- Mejue ndum n'akuku-ya dum.
Abu 169- Mejue ndum n'akuku-ya dum. |
Verse 1
Mejue ndum n'akuku-ya dum
N'otuto, Chinekem,
K'arum nile we kwuputa
Odidi-Gi, n'uzọ-I.
Verse 2
Ọ bugh nani ire n'obi
Ito Gi ka m'nario;
Kama, ndu nk'akuku-ya dum
Juru n'otuto-Gi.
Verse 3
Otutọ, n'ihe-kw'ubọchi,
Nbata n'opupu-ya;
Otutọ n'olu, n'omume
Nke dikariri nta.
Verse 4
Mejue ndum nile n'otuto,
Ka m'we kwuputa Gi
N'ihu-n'anya, o bu ezie
Na m'bu ony'ogbenye.
Verse 5
Otu a ka'I ganata n'akam
Otutọ kwesiri I;
M'we malite n'uwa abu
Nke di ohu mgbe dum.
Verse 6
Ehihie n'abali nile
Gabu oge di nsọ;
M'gesoro Gi nweko ihe
Na nzo-ukwum nile. Amen.
Abu 169- Mejue ndum n'akuku-ya dum.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com