Abu 168- Chinekem, ekelem Gi, Onye ker'uwa.
Abu 168- Chinekem, ekelem Gi, Onye ker'uwa. |
Verse 1
Chinekem, ekelem Gi, Onye ker'uwa,
Nke juru n'ebube n'onu, n'ihe na nma;
Otut'ihekwesir'otuto di n'ebe a.
Verse 2
Ekelem Gi n'I mere k'onu ba uba;
Ihe nke di nwayọ gbar'ayi gburugburu;
N'ebe gbakar'ochichi ihu-n'anya di.
Verse 3
Ekelem Gi kari, n'onu nwere nwuta;
Oge nile nwer'onyinyo, ogwu nadi;
K'on'uwa buru ihe-ndu, o bugh nkporo.
Verse 4
I mara, Nna,k'obi-ayi si we jid'uwa;
I we nye ayi onu di nro nke nwere nku,
Ime k'ayi hu ihe ka nsọ nenwu n'elu.
Verse 5
Ekelem Gi, n'ihe kasi nma akabiagh;
Egboro nkp'ayi, m'ayi nel'anya ihe nke ka:-
Udo dik'omimi nk'ayi nahugh n'oge mbu.
Verse 6
Ekelem Gi na nkpur'obi-ayi nwe ngọzi;
Ma h'agagh-achota iz'ike zur'oke
Rue mgbe ha gadabere n'obi nke Jisus. Amen.
Abu 168- Chinekem, ekelem Gi, Onye ker'uwa.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com