Abu 166- Sopuru Chineke n’ima-nma nki’idi-nsọ
Abu 166- Sopuru Chineke n’ima-nma nki’idi-nsọ |
Verse 1
Sopuru Chineke n’ima-nma nki’idi-nsọ!
Kpo isi ala, kwus’ọtutu-Ya;
Ol’edo nk’ina-nti, n’uda nki’idi-nwayọ,
Che n’iru Ya; Onye-nw’ayi n’Aha-Ya.
Verse 2
Were ibu-nchegbu-gi togbo n’ukwu-Ya;
Ọ geburu gi ya n’el’obi-Ya,
Kasie obi-I n’ihe-negbu, za ekpere-gi,
Nedu nzo-ukwu-gi k’o si to Ya.
Verse 3
Newebat’aku-ogbenye I gakpo nke-I,
Atul’egwu iba n’ogige- Ya;
Ima-nma nk’ezi’ okwu, n’ihu-n’anya di nro:
Ndia bu onyinye iche n;iru Ya.
Verse 4
M’ayi wer’ima-jijiji n’egwu weta ha,
Ọ ganata ha n’ihi Aha-Ya;
Ọ genye onu n’onudu anya-miri,
Nye kw’olil’anya na ntukwas’obi.
Verse 5
Sopuru Chineke n’ima-nma nki’idi-nsọ!
Kpo isi ala, kwus’ọtutu-Ya;
Ol’edo nk’ina-nti, n’uda nki’idi-nwayọ,
Che n’iru Ya; Onye-nw’ayi n’Aha-Ya.
Amen.
Abu 166- Sopuru Chineke n’ima-nma nki’idi-nsọ
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com