Abu 162- Ọ dim ka'nabu mgbe nile.
Abu 76- Bia n'etiti ayi Chineke. |
Verse 1
Ọ dim ka'nabu mgbe nile,
Emewo k'akwam bie;
N'ihi na Jisus bu Enyim,
Ka m'fe Ya kw'ubọchi!
Kọrọs:-
Ka m'to Ya, to Ya, to Ya
Mgbe nile!
To Ya, to Ya, ka m'to Ya
Mgbe nile!
Verse 2
Mgbe m'huru Onye-nwem n'obe,
Akpogburu n'ihim,
Akwaram akwa; ma ugbu a
Anameto mgbe dum.
Verse 3
Mgbe onwunwa nanwa obim
Ka m' si “Jisus bu nkem!”
Anya-miri gagbam n'ezie,
M'anameto mgbe dum.
Verse 4
Akuko Nw'aturu Chuku
Were inu-gi ko,
Ka ndi'ozo wer'abu onu
Naga, neto mgbe dum. Amen.
Abu 162- Ọ dim ka'nabu mgbe nile.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com