Abu 159- Ihu-n'anya nke kachasi.
Abu 159- Ihu-n'anya nke kachasi. |
Verse 1
Ihu-n'anya nke kachasi,
Onu nk'igwé bia n'uwa!
K'eb'obibi-Gi di nim'ayi,
Kpube ebere-Gi dum!
Verse 2
Jisus, I juru n'omiko,
Gi bu ez'ihu-n'anya;
Were nzọputa-Gi let'ayi,
Ba n'obi natu egwu.
Verse 3
Bia, Onye-nzọputa d'ike,
K'ayi nile nar'amara-I;
Bia na mberede, we ghara
Irapu obi'ayi ozo!
Verse 4
Ayi ganagozi I mgbe nile ,
Nefe Gi dika nd'igwé;
Nekpe, neto Gi, naṅuri
N'ihu-n'anya-I zur'oke.
Verse 5
Kezue okike ohu-Gi,
K'ayi di'ọcha nenwegh ntupo;
K'ayi hu oke nzọputa-Gi,
Zu kwa oke nime Gi.
Verse 6
K'eji otuto nenwogh'ayi,
Rue mgb'ayi ganodu n'igwé,
Togb'okpu-ez'ayi n'iru Gi,
Neto Gi n'ihu-n'anya.
Amen.
Abu 159- Ihu-n'anya nke kachasi.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com