Abu 155- To Jisos, Onye ngbaputa nke di ngọzi.
Abu 155- To Jisos, Onye ngbaputa nke di ngọzi. |
Verse 1
To Jisos, Onye ngbaputa nke di ngọzi!
K'uwa nabu ok'ihu-n'anya-Ya;
Kele Ya, nd'isi-m-ozi nke bi n'otuto,
K'ike na nsọpuru dir'Aha-Ya!
Jisos geche umu-Ya dik'aturu,
Kw'ubọchi k'Ọ neku ha n'aka-Ya.
Kọrọs:-
To Ya! To Ya! nekwu na Ya bu Okaka.
To Ya! To Ya! n'abu onu mgbe dum.
Verse 2
To Jisus, Onye-ngbaputa nke di ngọzi!
Ọ nwuru n'ihi nmehie-ayi nile;
Ya bu nkume nzọputa ebigh-ebi-ayi,
Kele Jisos, Onye akpogburu!
Nye Y'otuto, Onye hur'ayi ahuhu;
Ihu-n'anya nke nenwegh ih'atu!
Verse 3
To Jisos, Onye-ngbaputa nke di ngọzi!
Hosanna nakpotu nim'el'igwé.
Jisos Kraist gabu eze mgbe ebigh-ebi:
Me Ya Eze, ndi nzuko-Ya nile!
Ọ nabia dik'Onye-nmeri n'el'uwa,
Ike n'otuto diri Onye-nw'ayi! Amen.
Abu 155- To Jisos, Onye ngbaputa nke di ngọzi.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com