Abu 154- Otutọ diri Chuku n'ih'Ọ luru.
Abu 154- Otutọ diri Chuku n'ih'Ọ luru. |
verse 1
Otutọ diri Chuku n'ih'Ọ luru!
Ọ hur'uwa n'anya, nye Ọkpara-Ya,
Nke togboro ndu-Ya ikpuchi nmehie,
Mehepu uzọ ndu k'ora we bata.
Kọrọs:-
To Chuku! To Chuku! K'uwa nur'olu-Ya!
To Chuku! To Chuku! Ka madu dum nuria1
Biko, biakute Nna site na Jisos;
Nye Ya otuto n'ok'ihe Ọ luru!
verse 2
Ezi ngbaputa nk'eji obara go!
Onye kwere ka nkwa Chineke diri,
Onye kachasi njọ nke kwere n'ezie,
Jisos gagbaghara nmehie-ya ugbua.
verse 3
Ok'ihe Ọ zir'ayi, ok'ih'Ọ luru,
Ok'onu k'ayi nwere site na Jisos;
M'ayi ganaṅuri onu nke kachasi,
Neti nkpu n'ebube mgbe ayi gahu Ya. Amen.
Abu 154- Otutọ diri Chuku n'ih'Ọ luru.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord. You may check A & M Hymns here too.
.Site Credit: 9jainformed.com