Abu 141- Mgbe ayi ruru n'ahuhu.
Verse 1
Mgbe ayi ruru n'ahuhu,
Mgbe anya-miri nagb-ayi,
Mgb'ayi nakwa ndi-ayi lara,
Jisus, Nwa Devid, nuru.
Verse 2
I yir'anu-aru-ayi,
I buru ihe-ngbu-ayi;
I gbapur'anya-miri,
Jisus, Nwa Devid, nuru.
Verse 3
I rubew'isi-I n'onwu,
wisiw'obara-ndu;
Adobar'ozu-I n'ili,
Jisus, Nwa Devid, nuru.
Verse 4
Mgbe obi neru uju,
Neche nmehie-ya nile;
Mgbe mo-ayi natu egwu,
Jisus, Nwa Devid, nuru.
Verse 5
Mgbe atan onwu naku
N'ihi obi-ayi nala;
Mgb'ubọchi'ikpe-ayi di nsọ,
Jisus, Nwa Devid, nuru.
Verse 6
I mar'ihere na ngbu
N'ihi njọ nabugh nke-Gi;
Ma I kwere ibu ha,
Jisus, Nwa Devid, nuru.
Verse 7
I gabigara n'onwu,
I sachapuru njọ-ayi;
I no n'aka-nri Chuku,
Ọkpara Chuku nuru. Amen.
Abu 141- Mgbe ayi ruru n'ahuhu.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com