Abu 140- Ndi kwuru nwe ngọzi.
Verse 1
Ndi kwuru nwe ngọzi,
Nez'ike na Jisus,
Ndi tukwasir'isi
N'obi-Ya mgbe nile.
Verse 2
Ohu nke di ngọzi,
Nenwegh ochichiri!
Ha hu Ihe nk'ihe,
Nke ha huru n'anya.
Verse 3
H'aagafewo uwa,
Ya na ahuhu-Ya;
Ih'egwu nk'abali,
N'anwu nekpo oku.
Verse 4
Jisus geduru ha
N'eb'ifufe adigh;
Eb'ahihia neto
Na nsọ is'iyi ndu.
Verse 5
Nani ayi, ndi no nsọ
Ili, bu ndi kwara
Ih'oge gar'aga,
N'onyinyo fọduru.
Verse 6
Olu-ha n'iru-ha,
Ihu-n'anya ha ji-
Na mgbe-ya fọduru,
Uwa amagh kwa ha.
Verse 7
Ndi nwer'obi-ọma,
Nche ikp'azu agwu!
Ayi nakwa n'ih'unu,
Atal'ayi, Kraist kwara!
Verse 8
Ngwa ngwa mgbe chi gabo,
Olu oku Jisus
Nke ka onwu n'ike
Gasi, Bilie, nuria! Amen.
Abu 140- Ndi kwuru nwe ngọzi.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com