Abu 127- Chineke, wedat'onwe-Gi.
Verse 1
Chineke, wedat'onwe-Gi,
Nuru ekpere Nzuko-Gi,
N'ihi ndi gekwus'okwu-Gi,
Ndi jikere ije ozi-I.
Verse 2
Nna, were ebere-I kunye
Ume ndu Mọ Naso-Gi n'aru
Ndi akpor'izu aturu
Nke Kraist ji onwu-Ya gbata.
Verse 3
Kraist, si n'aka-I amapuru,
Wukwasi ha onyi-Gi;
Ka ndi guzọro n'iru Gi
Neme uche-I n'ihu-n'anya.
Verse 4
Mọ di ngọzi, binyere ha,
Nye amara ikp'ekpere;
K'ebe ha nedu aturu-I,
Ha we naga n'uzọ di nkpa.
Verse 5
Chuku, zitere ha ike-I,
Chebe ha ka ha pua na njọ;
Ka ha nogide nime Gi,
Nat'okpu nke ndu m'emesia. Amen.
Abu 127- Chineke, wedat'onwe-Gi.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com