Abu 126- Chineke, wusa Mọ Nsọ-Gi.
Verse 1
Chineke, wusa Mọ Nsọ-Gi,
Gozie ndi-oru-Gi n'ebe a;
Nye ha onyinye n'amara,
Ka nd'uko-I yir'ez'omume.
Verse 2
Mgbe ha neguzọ n'ulo nsọ-I
Izi ezi okwu k'I si zi,
Jisus, ka ndi-m'ozi-zi nenwu
Dika kpakpando n'aka-Gi.
Verse 3
Nye h'amam-ihe n'okwukwe,
Obi-um'ala n'id'ike,
Ka ha nenwe ndi nke-I n'obi,
Hu ha n'anya dik'I si hu.
Verse 4
Neche, nekpe, ghar'ida mba
Ehiehie n'abali nile;
Nado ndi-njọ aka na nti,
Nazu umu-aturu-Gi.
Verse 5
Ka mgb'olu-ha gagwu n'uwa,
Ha wer'olil'anya lubie;
Mgbe Ony'isi-nche-ayi gabia
Kwe k'ayi nah u buru ndi nke-I. Amen.
Abu 126- Chineke, wusa Mọ Nsọ-Gi.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com