Abu 118- Chukum, I dozir'oriri.
Verse 1
Chukum, I dozir'oriri,
Ya na iko ihu-n'anya?
Duta umu-Gi dum n'ebe a,
Ka ha mar autọ nke-Gi.
Verse 2
Oriri Nsọ Jisus doro,
Aru na Obara nke-Ya !
Ọ nwer'onu, b'onye nara
Manya nsọ nka na Nri nk'igwé.
Verse 3
N'ihi gini k'edoziri
Ezi oriri nka n'efu?
Jisus anwugh n'ihi unu,
Enyegh unu nri umu-nta?
Verse 4
Me k'asopuru Oriri-I,
Ka ndi nile akporo bia;
Ka madu dum hu nzọputa,
Ndi nara ihe-mbe n'ebe a.
Verse 5
Ka madu nile jikere,
Wer'obi nanu oku bia;
Mgbe ayi gesi n ebe a bilie,
K'ayi were onu n'uru la !
Amen.
Abu 118- Chukum, I dozir'oriri.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com