Abu 113- Jisus, Gi onu nke obi.
Verse 1
Jisus, Gi onu nke obi,
Iyi nke ndu, Ihe madu;
Site n'onu nile nk'uwa
Ayi biakute I ozo n'agu.
Verse 2
Ezi'okwu-Gi enwegh ngbanwe,
I nazo ndi nakpoku Gi;
I diri ndi nachọ Gin ma,
Ndi chotara Gi-ihe dum !
Verse 3
Ayi neri Gi, Nri nenye ndu,
Nachọ k'ayi neri Gi mgbe dum;
Ayi nanu Gi, Isi-iyi,
Nachọ k'I mejue obi-ayi.
Verse 4
Obi-nchegbu-ayi nachọ Gi
N'ebe nile ayi no n'uwa;
Ayi naṅuri n'iru-ọma-I,
Ayi nwe ngọzi m'ayi kwes'ike.
Verse 5
Jisus, noyer'ayi mgbe nile,
Me k'ubọchi-ayi dum di nma;
Chupu ochichiri nke njọ,
Me k'ihe nsọ-Gi nwue n'uwa. Amen.
Abu 113- Jisus, Gi onu nke obi.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com