Abu 108- Nna, chebe umu-ayi.
Verse 1
Nna, chebe umu-ayi;
Ayi amagh ihe nke nabia n'uwa;
N'okpuru ndo nku el'igwé nke-Gi
Debe ha: Gi onye nyere ha ndu.
Verse 2
Nna, biarute ayi nsọ;
K'aka-nchegide-Gi di n'isi-ayi;
Makua umu-ayi nsọ n'akuku-Gi,
Ha we di n'udo n'oge og'uwa.
Verse 3
Zo ha n'im'ulo-Gi;
Zo ha, debe kwa ha n'idi-ọcha,
Mgbe njọ na nchehie bar-uba n'uwa;
Mgb'Ekwensu nanwa, n'agu-njọ nadi.
Verse 4
Nedebe ha na nsọ,
Nemwegh ntupo nim'onwunwa nk'uwa;
Ka ha we soro ayi n'uwe ọcha,
Ba nim'on'uzọ igwé na nmeri. Amen.
Abu 108- Nna, chebe umu-ayi.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com