Abu 1- Nsọ, Nsọ, Nsọ! Chuku-Okike
Verse 1
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Chuku-Okike,
N'isi ụtụtụ ayị gabụ abụ nye Gi;
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Onye-ebere,
Atọ nim'Otu, Chuku dị ngọzi.
Verse 2
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Ndị nsọ neto Gị,
Natụda okpu-ha n'iru oche-eze-Gị;
Cherubim na Serafim nada n'iru Gị,
Onye nọri, nanọ, ganọgide.
Verse 3
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Gị dị ebube,
Anya ndị-nmehie apụgh ihụ otuto-Gị;
Ọ bụ nanị I di nsọ: ọ digh ony'ọzọ
Zur'oke n'ike, na ihu-n'anya.
Verse 4
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Chuku-Okike,
Ọlu-Gi dum n'igwé n'uwa geto aha-Gi.
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Onye-ebere,
Atọ nim'Otu, Chuku di ngọzi. Amen.
Abu 1- Nsọ, Nsọ, Nsọ! Chuku-Okike